Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ndi-ha águkotara agukọta di nnù iri-na-asatọ na ọgu iri-na-ise.
Umu Giashon we nwe obodo iri na atọ sitere n'ab͕uru nile nke ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa na nkera ebo Manase nime Beshan, n'ife-nzà.