Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 3:20 - Bible Nso

20 Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị: Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị agbụrụ Livayị, dịka ezinaụlọ ha si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 3:20
15 Iomraidhean Croise  

nke umu Merari; Asaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri-na-otù:


Nke Jedutun: umu-ndikom Jedutun; Gedalaia, na Zeri, na Jeshaia, na Hashabaia, na Matitaia, isi; ha nọ n'aka nna-ha, bú Jedutun, onye nēwere ubọ-akwara bu amuma bayere ikele na ito Jehova.


Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.


Umu-ndikom Merari; Mahli, Libni nwa-ya, Shimai nwa-ya, Uza nwa-ya;


Ndi Livai we bilie, bú Mehat nwa Amasai, na Joel mwa Azaraia, ndi sitere n'umu ndi Kohat: na Kish nwa Abdi, na Azaraia nwa Jehalelel, ndi sitere n'umu Merari: na Joa nwa Zima, na Iden nwa Joa, ndi sitere na ndi Giashon:


na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n'iru, n'ihe-ndebe nile ha n'òkè nile ha;


Ndia bu kwa aha umu-ndikom Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di; Giashon, na Kohat, na Merari: arọ ndu Livai di ọgu arọ isi na iri na asa.


Umu-ndikom Merari kwa; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di.


ab͕uru ulo Livai iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ndi Shimai iche, na ndinyom-ha iche;


Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.


Nke Giashon bu ab͕uru ndi Libni, na ab͕uru ndi Shimai: ndia bu ab͕uru ndi Giashon.


Nke Merari bu ab͕uru ndi Mahli, na ab͕uru ndi Mushi: ndia bu ab͕uru Merari.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan