Nke Himan: umu-ndikom Himan; Bukia, na Matanaia, na Uziel, na Shebuel, na Jerimot, na Hananaia, na Hanani, na Eliata, na Gidalti, na Romamti-eza, na Joshbekasha, na Maloti, na Hotia, na Mahaziot:
Ndi Livai we bilie, bú Mehat nwa Amasai, na Joel mwa Azaraia, ndi sitere n'umu ndi Kohat: na Kish nwa Abdi, na Azaraia nwa Jehalelel, ndi sitere n'umu Merari: na Joa nwa Zima, na Iden nwa Joa, ndi sitere na ndi Giashon: