Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.
N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha.
Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke ndi Kohat, onye ọ bula nke nēfè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Giashon, onye ọ bula nke n-efè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova.
ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi: