Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 29:39 - Bible Nso

39 Ndia ka unu gēmere Jehova na mb͕e nile unu akara àkà, nāgughi nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, iji chu àjà-nsure-ọku nile unu, na iji chu onyinye-inata-iru-ọma nile unu, na iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu nile unu, na iji chu àjà-udo nile unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 “ ‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 29:39
20 Iomraidhean Croise  

na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova:


Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile.


O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n'àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n'ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n'ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n'iwu Jehova.


Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya;


mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.


bayere achicha anēdebe n'usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.


Ọnwa ọhu nile unu na mb͕e nile unu akara àkà, nkpuru-obim akpọwo ha asì: ha aghọwo ibu di arọ̀ n'arum, ike ibūru ha agwuwom.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà.


Ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje n'otu ubọchi ahu: n'ihi na ubọchi nkpuchi-nmehie ka ọ bu, ikpuchiri unu nmehie-unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu.


nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova.


Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova.


N'ihi na ọ buru na unu esurerem àjà-nsure-ọku nile na onyinye-inata-iru-ọma nile unu, ha agaghi-atọm utọ: ọ bu kwa àjà-udo nke anu mara abuba nile unu ka M'nāgaghi-elegide.


Nye umu Israel iwu, si ha, Onyinyem iji biaru nso, nrim iji chu àjà-ọkum nile, bú ihe ísì utọ nkem, unu gēlezi anya iweta ya nsom na mb͕e-ya akara àkà.


na otù nkpi iji chu aja-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.


Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di.


Nka bu iwu onye-Nazirait onye nēkwe nkwa, na nke onyinye-ya iji biarue Jehova nso bayere nkewaputa-ya, nāgughi ihe aka-ya gēru: dika nkwa-ya si di, nke ọ nekwe, otú a ka ọ gēme n'iwu nkewaputa-ya.


Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.


ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan