Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 29:18 - Bible Nso

18 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 29:18
8 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya:


Unu gēweta kwa nso umu-aturu asa ndi zuru okè nke b͕ara otù arọ, na otù nwa-oke-ehi, na ebulu abua, tiyere achicha ahu: ha gābu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova, ha na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ.


Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n'uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n'ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n'anya.


nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan