Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 28:7 - Bible Nso

7 Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n'uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n'ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 28:7
17 Iomraidhean Croise  

otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephad utu oka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu gādiri otù nwa-aturu ahu; ya na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manya-vine, ka ọ buru àjà-ihe-ọṅuṅu.


Ọ gābu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova: ebe M'gēzute unu, igwa gi okwu n'ebe ahu.


Unu ewerela ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke ala ọzọ, ma-ọbu àjà-nsure-ọku, ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma, sure dika àjà n'elu ya; unu awusi-kwa-la àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya.


N'etiti nkume kwọrọ murumuru nke miri-iyi ka òkè-gi di; ha onwe-ha, ha onwe-ha bu ihe ruru gi n'ife-nzà: ọ bu kwa ha ka i wusiworo àjà-ihe-ọṅuṅu nye, sure kwa àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma. Àgākasim obi bayere ihe ndia?


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú.


Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n'azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin.


Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.


manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin, tiyere àjà-nsure-ọku ahu, ma-ọbu iji chu àjà ọzọ ahu, ka i gēdoziri otù nwa-aturu.


Manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, ka i gēweta kwa nso, ka ọ buru ihe ísì utọ isurere Jehova.


Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ.


Unu gāchu ha nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, (nke zuru okè ka ha gāburu unu), na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha.


Ọ bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, nke emere n'ugwu Sainai ka ọ buru ihe ísì utọ, bú àjà-ọku anāchuru Jehova.


Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi: dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ibu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere jehova.


E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan