Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 28:6 - Bible Nso

6 Ọ bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, nke emere n'ugwu Sainai ka ọ buru ihe ísì utọ, bú àjà-ọku anāchuru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nke a bụ aja nsure ọkụ ahụ Onyenwe anyị nyere iwu ya nʼugwu Saịnaị na a ga na-achụrụ ya mgbe niile, dịka aja isisi ya dị ezi mma, aja nke a chụrụ site nʼọkụ nye Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 28:6
15 Iomraidhean Croise  

Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.


O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n'àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n'ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n'ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n'iwu Jehova.


Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya;


Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba; Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.


Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.


Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.


I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n'uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n'ukpuru ebighi-ebi.


Otú a ka ha gēdozi nwa-aturu ahu, na onyinye-inata-iru-ọma ahu, na manu ahu, kwa-ututu kwa-ututu, ibu àjà-nsure-ọku mb͕e nile.


Ndia bu ihe enyere n'iwu, nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere umu Israel n'ugwu Sainai.


Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya.


Ọ̀ di àjà di iche iche na onyinye-inata-iru-ọma unu wetaram n'ọzara ọgu arọ abua, unu ulo Israel?


na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu ka ọ buru onyinye-inata-iru-oma.


Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n'uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n'ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n'anya.


E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan