Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 28:14 - Bible Nso

14 Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 28:14
11 Iomraidhean Croise  

mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.


Unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsì ísi utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta -- apughm inagide ajọ omume na ubọchi nb͕ochi.


M'gēme kwa ka ọ kwusiri Moab, bú onye nēsure àjà-nsure-ọku n'ebe di elu, na onye nēsurere chi di iche ya ihe-nsure-ọku nesì ísì utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma àjà-nsure-ọku nke onye-isi gēweta nso Jehova n'ubọchi-izu-ike bu umu-aturu isi zuru okè na otù ebulu zuru okè;


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin, tiyere àjà-nsure-ọku ahu, ma-ọbu iji chu àjà ọzọ ahu, ka i gēdoziri otù nwa-aturu.


ọ gēweta kwa nso, tiyere nwa-oke-ehi ahu, onyinye-inata-iru-ọma, bú uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara na nkera hin nke manu.


na otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu nwa-aturu ọ bula; ọ bu àjà-nsure-ọku, ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.


Otù nkpi kwa iji chu àjà-nmehie nye Jehova; agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.


Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n'uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n'ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n'anya.


na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan