Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 28:11 - Bible Nso

11 Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 28:11
32 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.


na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova:


Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a.


Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.


ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu.


mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.


bayere achicha anēdebe n'usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.


Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ; Nti abua ka I ràpúworom: Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.


Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; Iwu-Gi di kwa nime obim.


Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu, N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.


N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu, Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.


Ọ gēru kwa, na site n'otù ọnwa ọhu rue ọnwa ọhu ọzọ, na site n'otù ubọchi-izu-ike rue ubọchi-izu-ike ọzọ, anu-aru nile, bú madu, gābia ikpọ isi ala n'irum, ka Jehova siri.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche iru n'Iru-anyanwu gābu ihe emechiri emechi n'ubọchi ọlu isi unu; ma n'ubọchi-izu-ike ka agēmeghe ya, ọ bu kwa n'ubọchi nke ọnwa ọhu ka agēmeghe ya.


Ma n'ubọchi ọnwa ọhu ọ gābu nwa-oke-ehi zuru okè, na umu-aturu isi, na otù ebulu, ihe zuru okè ka ha gābu:


ọ bu kwa otù ephah etiyere n'oke-ehi ahu, na otù ephah etiyere n'ebulu ahu, na ihe etiyere n'umu-aturu ahu dika aka-ya gēru, na manu, otù, hin otù ephah, ka o gēji dozie onyinye-inata-iru-ọma.


M'gēme kwa ka obi-utọ ya nile kwusi, ya na ememe-ya, na ọnwa ọhu ya, na ubọchi-izu-ike-ya, na mb͕e-ya nile akara àkà.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n'ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Nnunu, ọ̀ gādabà n'ib͕udu di n'ala, ebe ọ nādighi ọnyà esiri ya? ib͕udu, ò gēsi n'ala kpọhiepu, ma o jideghi ihe ọ bula?


si, Òle mb͕e ọnwa ọhu gāgabiga, ka ayi we re ọka? na ubọchi-izu-ike, ka ayi we cho ọka wheat? n'ime ka ọtùtù ephah di ntà, na ime ka ego shekel di uku, na ime ka ihe-ọtùtù aghughọ b͕agọrọ;


Ọ bu kwa n'ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n'elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n'elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n'iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu.


ma unu gēweta nso àjà-ọku, bú àjà nsure-ọku anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ: nke zuru okè ka ha gāburu unu:


Unu nēlezi anya idebe ubọchi, na ọnwa, na oge, na arọ.


Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:


Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,


Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n'iri ihe: ma zilagam, ka m'we zo onwem n'ọhia rue anyasi nwa-nne-echi.


Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n'iru gi: me ngwa ub͕u a, n'ihi na ta ka ọ batara n'obodo; n'ihi na ndi Israel nwere àjà ta n'ebe di elu a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan