M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ.
Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.
ha we si, Jehova nyere onye-nwem iwu inye umu Israel ala ahu n'ihe-nketa n'ife-nzà: enye-kwa-ra onye-nwem iwu n'ọnu Jehova iwere ihe-nketa Zelọfehad, bú nwa-nne-ayi, nye umu-ya ndinyom.
Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.