Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 26:62 - Bible Nso

62 Ndi-ha agukọtara agukọta di orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru: n'ihi na agukọtaghi ha n'etiti umu Israel, n'ihi na enyeghi ha ihe-nketa n'etiti umu Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

62 Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 26:62
14 Iomraidhean Croise  

Ma ndi Livai, dika ebo nke ndi bu nna-ha si di, agukọtaghi ha n'etiti ha.


Nání, agukọtala ebo Livai, aguta-kwa-la ọnu-ọgugu-ha n'etiti umu Israel:


Ndia bu ndi Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.


Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.


N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha.


ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù na otù nnù na ọgu iteghete.


N'ihi ya Livai esoghi umu-nne-ya nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa; Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ya, dika Jehova, bú Chineke-gi, gwara ya okwu.)


Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.


Ma Moses enyeghi ebo Livai ihe-nketa: Jehova, bú Chineke Israel, bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu.


N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan