61 Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ.
61 Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)
Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.
Nedab na Abaihu we nwua n'iru Jehova, mb͕e ha wetara nso ọku ala ọzọ n'iru Jehova n'ọzara Sainai, ha enweghi kwa nwa; Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà n'iru Eron, bú nna-ha.