60 Amu-kwa-ra nye Eron Nebad na Abaihu na Eleeza na Itama.
60 Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.
Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron;ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.
Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.