Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu.
Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye; Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu: Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu; Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.
Ọ gēru kwa, na unu gēme ka ọ dayere unu n'ihe-nketa, ka ọ daye-kwa-ra ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti unu, ndi muworo umu n'etiti unu: ha gādi kwa unu dika ndi amuru n'ala n'etiti umu Israel; ha gēso unu dabà n'ihe-nketa n'etiti ebo nile nke Israel.
Ma ala-eze ahu, na ọchichi ahu, na idi-uku nke ala-eze nile n'okpuru elu-igwe nile, ka agēnye ndi ahu, bú ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi nile gēfè kwa Ya, nu olu-Ya.
Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di.
Unu gēketa kwa ala ahu n'ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa.
Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n'òkè n'òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.
Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta;
ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.