Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata;
Ha we si n'ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha.
o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.
na ihe O mere Detan na Abairam, umu Eliab, nwa Reuben; mb͕e ala saghepuru ọnu-ya, loda ha, na ezi-na-ulo nile ha, na ulo-ikwū nile ha, na ihe ọ bula di ndu nke di n'ukwu-ha, n'etiti Israel nile: