Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 26:10 - Bible Nso

10 ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 26:10
15 Iomraidhean Croise  

Umu Israel we rie manna ahu ọgu arọ abua, rue mb͕e ha batara n'ala ebí ebí; manna ahu ka ha riri, rue mb͕e ha batara na nsọtu ala Kenean.


agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku:


M'gēdo kwa irum megide onye ahu, me ya ka ọ buru ihe-iju-anya, ka ọ ghọ ihe-iriba-ama na ilu, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndim; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


ha we bilie n'iru Moses, ha na ndikom ufọdu ndi sitere n'umu Israel, ọgu ndi isi nzukọ iri-na-abua na iri, ndi akpọrọ ibia na nzute, ndikom amara aha-ha:


bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.


Ma aha Eron ka i gēdekwasi na nkpa-n:aka Livai: n'ihi na ọ bu otù nkpa-n'aka ka onye-isi ọ bula nke ulo nke ndi bu nna-ha gēnwe.


Nna-ayi nwuru n'ọzara, ma ya onwe-ya adighi n'etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere.


na ihe O mere Detan na Abairam, umu Eliab, nwa Reuben; mb͕e ala saghepuru ọnu-ya, loda ha, na ezi-na-ulo nile ha, na ulo-ikwū nile ha, na ihe ọ bula di ndu nke di n'ukwu-ha, n'etiti Israel nile:


ha gādikwasi kwa gi ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube, dikwasi kwa nkpuru-gi-rue mb͕e ebighi-ebi:


O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke;


Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.


Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan