Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 24:4 - Bible Nso

4 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke, Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile, Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 24:4
20 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.


O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya.


Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo.


Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù, Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike; Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.


Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.


Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.


Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.


Jehova we saghe anya Belam abua, o we hu mọ-ozi nke Jehova ka ọ nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: o we rube isi, kpọ isi ala n'iru-ya.


Ọ we tua ilu-ya, si, Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta, Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:


Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob! Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!


agu we gua ya, o we chọ idetu ihe ọnu: ma mb͕e ha nēdozi ihe, ihe di ka inyoghi biara ya n'anya;


Ma mb͕e ọhù ahu nādi n'obi Pita, Mọ Nsọ siri ya, Le, ndikom atọ nāchọ gi.


O we rue, mb͕e m'laghachisiri na Jerusalem, mb͕e m'nēkpe kwa ekpere n'ulo uku Chineke, na ihe di ka inyoghi biaram n'anya,


Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì,


Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,


Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n'iru Samuel, da n'ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N'ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan