Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 24:24 - Bible Nso

24 Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia, Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala, Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 24:24
24 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim.


Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu.


Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.


Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n'aka ka ọ bu kwa n'aka-ha, bú oké iwem!


Ibu eboro Taia. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya.


Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me.


O we si, Ì mara ihe m'jiri biakute gi? ma ub͕u a m'gālaghachi ibuso onye-isi Peasia agha: ma mb͕e mu onwem nāpu, le, onye-isi Jevan gābata.


Ma ub͕ọ Kitim gābia imegide ya; obi-ya ewe mebie emebi, o we laghachi, wesa ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu oké iwe, me ihe, laghachi, tugharia uche na ndi nārapu ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu.


Ọ gāma kwa ulo-ikwū nile nke ulo uku ya n'etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahu mara nma; ma ọ gābiaru ọgwugwu-ya, ọ dighi kwa onye ganēyere ya aka.


Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.


N'ihi na i huru na awaputara otù nkume n'ugwu ahu nke anējighi aka wa, na o tipiara ígwè ahu na ọla ahu na urọ ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu; Chineke di uku emewo ka eze mara ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: nrọ a nēguzosi kwa ike, ọ bu kwa ihe kwesiri ntukwasi-obi ka akukọ-isi-ya bu.


Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.


Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si, Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu; Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.


Ọ we tua ilu-ya, si, Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?


Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),


Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa.


Ọ buru na ayi arapu Ya otú a, madu nile gēkwere na Ya: ndi Rom gābia kwa napu ebe nke ayi na mba nke ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan