ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n'ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n'ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a.
Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.