Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 24:20 - Bible Nso

20 Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si, Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu; Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 24:20
18 Iomraidhean Croise  

Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ.


Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.


Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n'ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ.


Eze we si ka eme ya otú a: ewe nye iwu nime Shushan; ha we kwuba umu-ndikom iri nke Heman.


Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.


ọ si, Aka dikwasi oche-eze Ja, agha ka Jehova gēbuso Amalek site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ.


Amalek we bia, buso Israel agha nime Refidim.


Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile, Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.


Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia, Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala, Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.


Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa, Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri, Eze-ya gādi kwa elu kari Egag, Agēbuli kwa ala-eze-ya.


O rue, ọ buru na Israel agha nkpuru, na ndi Midian rigoro ya, na ndi Amalek, na umu Iru-anyanwu; ha we rigo imegide ha;


O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n'aka ndi nāpunara ha ihe.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Elekọtawom ihe Amalek mere Israel, ihe o doro ya n'uzọ, mb͕e o siri n'Ijipt rigota.


O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,


Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan