Ọnụọgụgụ 24:17 - Bible Nso17 Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile, Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a17 “Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile. Faic an caibideil |
M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.