Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 24:14 - Bible Nso

14 Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 24:14
16 Iomraidhean Croise  

Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndi-nkpọrọ n'olùlù, agēmechibido kwa ha n'ulo-nkpọrọ, mb͕e ubọchi gasiri agēleta ha.


Ma M'gēme ka ndi Moab adọtara n'agha laghachi n'ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.


Ma o gēru, n'ikpe-azu nke ubọchi nile, na M'gēme ka ndi Ilam adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.


ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu:


emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova.


Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,


Belam we bilie, je, laghachi n'ebe-ya; ọzọ kwa, Belak jere n'uzọ-ya.


Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu: Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:


Ma mara nka, na oge di oké egwu gābia na mb͕e ikpe-azu.


Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n'etiti ndi ha b͕uru.


Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.


Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan