Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 23:5 - Bible Nso

5 Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 23:5
14 Iomraidhean Croise  

I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.


Madu nwe ido obi n'usoro: Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.


Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.


M'we tiye okwum nile n'ọnu-gi, ọ bu kwa na ǹdò akam ka M'kpuchiworo gi, iku elu-igwe dika ihe-ọkukú, na itọ ntọ-ala nke uwa, na isi Zaion, Ndim ka i bu.


Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n'ọnu-gi:


Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.


Mọ-ozi nke Jehova we si Belam, Soro ndikom ahu je: ma nání okwu ahu nke m'gāgwa gi, nke ahu ka i gēkwu. Belam we soro ndi-isi Belak je.


Jehova we zute Belam, tiye okwu n'ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.


Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula.


Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile.


n'ihi na Mọ Nsọ gēzí unu n'oge hour ahu ihe unu nāghaghi ikwu.


Ma o kwughi nka site n'onwe-ya: kama ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, o buru amuma na Jisus gaje inwu anwu n'ọnọdu mba ahu;


M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan