25 Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli.
25 Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum, Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya: Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara, Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.
Belam we za, si Belak, Àgwaghm i, si, Ihe nile nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēme?