Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 23:24 - Bible Nso

24 Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum, Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya: Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara, Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 23:24
20 Iomraidhean Croise  

Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu: N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru, N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.


Nwa-ọdum ka Juda bu; N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo; O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?


Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.


Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, na ihe-nb͕akwasi-ukwu eji ọla-edo me, ejikọrọ ha na oche-eze ahu, aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'elu ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu.


Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike, Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo.


Ọdum, nke bu dike n'etiti anu nile, Ọ dighi-esi kwa n'iru ihe ọ bula laghachi azu;


N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.


Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọdum ab͕ọwo uja, ọ̀ bu onye nāgaghi-atu egwu? Onye-nwe-ayi Jehova ekwuwo, ọ̀ bu onye nāgaghi-ebu amuma?


Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.


Ọdum nādọb͕u anu gēzuru umu-ya, ọ nātọb͕uta-kwa-ra nne-ọdum-ya nile anu, we kpojue ọb͕à-ya nile n'anu-ndọb͕u, kpoju kwa ebe-obibi-ya nile n'anu ọ dọb͕uworo.


N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem.


Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli.


Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,


Ọ we kwue ihe bayere Gad, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara: Dika nne-ọdum ka ọ nēbi, Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi.


otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan