Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 23:22 - Bible Nso

22 Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt. Ha dị ike dịka ehi ọhịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 23:22
14 Iomraidhean Croise  

Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.


Onye anātu egwu ka Chineke bu site n'ebe nsọ Gi nile: Chineke nke Israel, Ya onwe-ya nēnye ndi-Ya ike na ume. Onye agọziri agọzi ka Chineke bu.


Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu: Ejiwo manu ọhu wusam.


O rue, n'ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n'otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n'ala Ijipt pua.


O rue, n'otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.


Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e agāsọpurum n'aru Fero, na n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya.


Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.


ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.


Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.


Ọ we zigara Belam nwa Beoa ndi-ozi, rue Petoa, nke di n'akuku Osimiri, bú ala nke umu ndi-ya, ikpọ ya, si, Le, otù ndi esiwo n'Ijipt puta: le, ha ekpuchiwo iru ala, ndi ahu nānọ kwa na ncherita-irum:


Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere: O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya, Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha, Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.


Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.


N'ihi na ayi anuwo otú Jehova mere ka miri Oké Osimiri Uhie takọrọ n'iru unu, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na ihe unu mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan, bú Saihon na Og, ndi unu wezugara ka ebibie ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan