Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 22:8 - Bible Nso

8 o we si ha, Nọnu ọnọdu-abali n'ebe a n'abali a, m'gēweghachi-kwa-ra unu okwu, dika Jehova si agwam okwu: ndi-isi Moab we nọyere Belam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla Onyenwe anyị nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 22:8
13 Iomraidhean Croise  

Onye nke Chineke ahu we si eze, Ọ buru na i nyem nkera ulo-gi, m'gaghi-esoro gi ba, m'gaghi-eri kwa nri, m'gaghi-aṅu kwa miri n'ebe a:


Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m'gēkwu.


I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n'ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n'ebe di anya.


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.


Belam we za, si ndi-orù Belak, Ọ buru na Belak enyewo m ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu nke Jehova, bú Chinekem, ime ihe ntà ma-ọbu ihe uku.


Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu.


Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak.


Chineke we biakute Belam, si, Òle ndi bu ndikom ndia nọyere gi?


Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu?


Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi.


Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan