Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 22:31 - Bible Nso

31 Jehova we saghe anya Belam abua, o we hu mọ-ozi nke Jehova ka ọ nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: o we rube isi, kpọ isi ala n'iru-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 22:31
14 Iomraidhean Croise  

Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua.


Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.


Jehova, doro ha ihe-egwu: Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu. Selah


Moses we me ngwa, rube isi-ya n'ala, kpọ isi ala.


Nne-inyinya-ibu ahu we si Belam, Mù onwem abughi nne-inyinya-ibu-gi, nke i nọkwasiworo nam n'ogologo mb͕e-gi rue ta? ànọm nēme gi otú a ma-ọli? Ọ si, É-è.


Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke, Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu, Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:


Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke, Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile, Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:


Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya.


Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n'anya-ha.


Ya mere mb͕e Ọ siri ha, Mu onwem bu Ya, ha la azu, we da n'ala.


isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu.


O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?


Ọ si, É-è; kama mu onwem bu onye-isi usu-ndi-agha Jehova; ub͕u a ka m'biaworo. Joshua we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si ya, Gini ka onye-nwem nāgwa orù-ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan