Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 22:23 - Bible Nso

23 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n'uzọ, je n'ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n'uzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 22:23
11 Iomraidhean Croise  

Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n'inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha.


Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.


Ọbuná ub͕ala n'elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.


Mu onwem, bú Daniel, náním, huru ọhù ahu: ma ndikom ahu ndi mu na ha nọ ahughi ọhù ahu; ma otù ọ di, oké ọma-jijiji dakwasiri ha, ha we b͕alaga izobe onwe-ha.


Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya.


Mọ-ozi nke Jehova we guzo n'uzọ di warara n'etiti ubi-vine, ogige di n'otú akuku, ogige di kwa n'akuku nke-ọzọ.


Ma ndi mu na ha nọ kiliri ìhè ahu n'ezie, ma ha anughi olu Onye ahu nāgwam okwu.


O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?


ma aturu ya nmebi iwu nke aka ya n'anya: inyinya-ibu nke dara ob͕i were olu madu kwu okwu we b͕ochie anya-adighi-nma nke onye-amuma ahu.


Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan