Ọnụọgụgụ 21:9 - Bible Nso9 Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ. Faic an caibideil |
M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.