Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 21:5 - Bible Nso

5 Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 21:5
19 Iomraidhean Croise  

Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo: Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma: Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku.


Ha we kwue okwu megide Chineke; Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara?


Ha si Moses, Ọ̀ bu n'ihi na ílì adighi n'Ijipt na i chipuwo ayi inwu n'ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n'ime ka ayi si n'Ijipt puta?


Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu?


Umu Israel we hu ya, sirita onwe-ha, Gini ka ọ bu? n'ihi na ha amaghi ihe ọ bu. Moses si ha, Nke ahu bu nri nke Jehova nyeworo unu ka unu rie.


Ulo Israel we kpọ aha-ya Manna: ihe ahu di ka nkpuru coriander, ọ di ọcha; idetu ya ire ọ di ka achicha wafer eji manu-aṅu me.


Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi: Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ.


Umu-ha we nupu isi n'okpurum; ha ejeghi ije n'ukpurum nile, ha edebeghi kwa ikpém nile ime ha, bú nke madu gādi ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'ọzara.


rue otù ọnwa zuru ezù, rue mb͕e o gēsi n'imi-unu puta, ọ we ghọrọ unu ihe-isọ-oyi: n'ihi na unu ajuwo Jehova Nke nọ n'etiti unu, unu we kwa ákwá n'iru Ya, si, N'ìhi gini kwa ka ayi siworo n'Ijipt puta?


Ma nzukọ nile nke umu Israel tamuru ntamu n'echi-ya megide Moses megide kwa Eron, si, Unu onwe-unu emewo ka ndi nke Jehova nwua.


Umu Israel we gwa Moses okwu, si, Le, ayi ekubìwo, ayi alawo n'iyì, ayi nile alawo n'iyì.


Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan