Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 21:24 - Bible Nso

24 Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n'Anon rue Jekob, rue umu Amon: n'ihi na ókè-ala umu Amon siri ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 21:24
24 Iomraidhean Croise  

Ọ we bilie n'abali ahu, chiri nwunye-ya abua, na ndinyom abua nējere ya ozi, na umu-ya iri na otù, gabiga ngabiga-miri Jakob.


Ọzọ, I nyere ha ala-eze na ndi di iche iche, we kè ha n'òkè n'òkè n'akuku nile: ha we nweta ala Saihon, bú ala nke eze Heshbon, na ala Og, bú eze Beshan.


Bú Saihon eze ndi-Amorait: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:


Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.


Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon, nke di n'ọzara, nke si n'ókè-ala ndi-Amorait aputa: n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n'etiti Moab na ndi-Amorait.


mb͕e o tib͕usiri Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke bi na Heshbon, na Og, bú eze Beshan, nke bi n'Ashtarot, n'Edrei:


Unu we biarue ebe a, Saihon, bú eze Heshbon, na Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi ibu agha, ayi we tib͕ue ha:


M'we nye ndi Reuben nye kwa ndi Gad site na Gilead we rue ndagwurugwu Anon, bú etiti ndagwurugwu ahu, ka ọ buru ókè-ala; we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;


Jehova gēme kwa ha dika O mere Saihon, me kwa Og, bú ndi-eze ndi-Amorait, me kwa ala-ha; ndi O kpochapuru.


n'ofè Jọdan, na ndagwurugwu ahu na ncherita-iru Bet-peoa, n'ala Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, onye Moses na umu Israel tib͕uru, mb͕e ha si n'Ijipt puta:


ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n'Ashtarot na n'Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha.


M'we me ka unu ba n'ala ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan; ha we buso unu agha: M'we nye ha n'aka-unu, unu we nweta ala-ha; M'we kpochapu ha n'iru unu.


na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot.


Jehova we si umu Israel, Àzọputaghm unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi-Amorait, na n'aka umu Amon, na n'aka ndi Filistia?


Eze umu Amon we si ndi-ozi Jefta, N'ihi na Israel were alam, mb͕e o si n'Ijipt rigota, site n'Anon we rue Jabok, ru kwa Jọdan: ma ub͕u a nyeghachi ala ahu nile n'udo.


Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan