Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 20:29 - Bible Nso

29 Nzukọ Israel nile we hu na Eron ekubiwo, ha we kwara Eron ákwá orú ubọchi na iri, bú ulo Israel nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 20:29
9 Iomraidhean Croise  

Chineke we kpọ ala-akọrọ ahu Ala; nchikọta miri ahu ka Ọ kpọkwara Oké Osimiri: Chineke we hu na ọ di nma.


Chineke we kpọ ìhè ahu Ehihie, ọchichiri ahu ka Ọ kpọkwara Abali. Anyasi we di, ututu we di, buru otù ubọchi.


Sera we nwua na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean: Abraham we bia itiri Sera aka n'obi, na ikwara ya ákwá.


Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.


Ewe debezuere ya ọgu ubọchi abua: n'ihi na otú a ka anēdebezu ubọchi ndi anāb͕asì ozu-ha: ndi Ijipt we kwara ya ákwá ọgu ubọchi atọ na iri.


Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá.


Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue.


Samuel we nwua; Israel nile we chikọta onwe-ha, tiere ya aka n'obi, lìe ya n'ulo-ya na Rema. Devid we bilie, rida rue ọzara Peran.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan