Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 20:24 - Bible Nso

24 Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 20:24
18 Iomraidhean Croise  

Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.


Ma ndia bu arọ nke ndu Ishmael, ọgu arọ isi na iri na asa: ọ we kubie ume, nwua; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.


Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.


Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.


Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het,


Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n'ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.


Le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu.


O we kpọ aha ebe ahu Masa, na Meriba, n'ihi ise-okwu nke umu Israel, na n'ihi na ha nwara Jehova, si, Jehova, Ọ̀ nọ n'etiti ayi, ma-ọbu na Ọ nọghi?


i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ gānwu kwa n'ebe ahu.


Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigoputa, ime ayi ka ayi bata n'ebe ọjọ a? ọ bughi ebe nke nkpuru-ọghigha, ma-ọbu nke osisi fig, ma-ọbu nke osisi vine, ma-ọbu nke osisi pomegranate; ọ dighi kwa miri iṅu.


Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya:


Bọrọ umu Israel ọ́bọ̀ n'aru ndi Mdian: emesia agāchikọta gi na umu-nna-gi n'ala-mọ.


N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha.


gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ:


Ọ we kwue ihe bayere Livai, si, Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi, Onye I nwara na Masa, Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;


ọ si ndikom ahu, Amawom na Jehova enyewo unu ala nka, amawokwam na oké ujọ-unu adakwasiwo ayi, amawokwam na ndi nile nēbi n'ala nka ab͕azewo n'iru unu.


Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan