Ma akuku Ndida nke nēche iru na Ndida gēsite na Tema rue miri Meribot-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. Nka bu kwa akuku Ndida nēche iru na Negeb.
Ma n'akuku ókè-ala Gad, n'akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku.
Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu.