Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 20:16 - Bible Nso

16 ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 20:16
14 Iomraidhean Croise  

Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova.


Mọ-ozi nke Chineke, nke nēje n'iru ọmuma-ulo-ikwū nke Israel, we bulie ije, je n'azu ha; ogidi igwe-oji ahu we si n'iru ha bulie ije, guzo n'azu ha:


Le, Mu onwem nēziga mọ-ozi n'iru gi, idebe gi n'uzọ, na ime ka i bata n'ebe ahu M'doziworo.


M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:


Ọzọ kwa, Mu onwem anuwo isu-ude umu Israel, ndi ndi Ijipt nēme ka ha buru orù; echetawokwam ọb͕ub͕a-ndum.


Chinekem ezitewo mọ-ozi-Ya, we kpuchita ọnu ọdum ndia, ha emerughkwam aru: n'ihi na n'iru Ya ọ bu emeghi-ihe-ọjọ ka ahuru nimem; ọzọ kwa, n'iru gi, eze, ọ dighi ihe-imeru-aru m'meworo.


na nna-ayi-hà ridara n'Ijipt, ayi we biri n'Ijipt ọtutu ubọchi; ndi Ijipt we mejo ayi, mejọ kwa nna-ayi-hà:


Ka m'gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi ba n'ọhia, ma-ọbu n'ubi-vine, ayi agaghi-aṅu miri olùlù-miri: n'uzọ eze ka ayi ganēje, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè- ala-gi.


Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom.


Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?


Ma n'ihi na Ọ huru nna-gi-hà n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n'Ijipt puta n'iru Ya;


Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan