Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 20:1 - Bible Nso

1 Umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we ba n'ọzara Zin n'ọnwa mbu: ndi Israel we nọdu na Kedesh; Miriam we nwua n'ebe ahu, ewe lìe ya n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 20:1
23 Iomraidhean Croise  

Ha we chigharia, bia En-mishpat (nke ahu bu Kedesh), tib͕ue ndi bi n'ọhia nile nke ndi Amalek, tib͕u kwa ndi-Amorait, ndi bi na Hazazon-tema.


Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu; Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.


Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.


Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n'ebe di anya, imara ihe gēme ya.


Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M'gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara?


Ma akuku Ndida nke nēche iru na Ndida gēsite na Tema rue miri Meribot-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. Nka bu kwa akuku Ndida nēche iru na Negeb.


N'ihi na M'mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa, ọ bu kwa n'ulo ndi-orù ka M'b͕aputara gi; M'we ziga Moses na Eron na Miriam iga n'iru gi.


Miriam na Eron we kwue okwu megide Moses n'ihi nwayi Etiopia ahu ọ lutara: n'ihi na nwayi Etiopia ka ọ lutara.


Igwe-oji ahu we si n'elu Ulo-ikwū ahu wezuga onwe-ya; ma, le, Miriam bu onye ekpenta, dika snow; Eron we che Miriam iru, ma, le, ọ bu onye-ekpenta.


Ewe mechibido Miriam uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: ma ndi Israel ebulighi ije rue mb͕e achikọtara Miriam na ndi Israel.


Ha we rigo, ledo ala ahu site n'ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat.


Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu.


ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:


Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa.


Moses we yipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya; Eron we nwua n'ebe ahu n'elu ugwu ahu: Moses na Eleeza we si n'ugwu ahu ridata.


Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n'Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi.


n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum n'ọzara Zin, n'ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M'gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n'anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n'ọzara Zin.)


Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh).


Unu we biri na Kedesh ọtutu ubọchi, dika ubọchi nile si di nke unu biri n'ebe ahu.


Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.


n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel.


n'ihi na mb͕e ha siri n'Ijipt rigota, Israel we je ije n'ọzara rue Oké Osimiri Uhie, biarue Kedesh;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan