Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 2:25 - Bible Nso

25 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di n'akuku Ugwu, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Dan nwere bu Ahieza nwa Amishadai.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ebo Dan na usuu ndị agha ha ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 2:25
7 Iomraidhean Croise  

Nke Dan; Ahieza nwa Amishadai.


Nke umu Dan, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ogugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;


Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.


Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na ise.


Onye-isi ulo nna nke ab͕uru abua Merari nwere bu Zuriel nwa Abihail: ha nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu.


N'ubọchi nke-iri onye-isi umu Dan nwere, bú Ahieza nwa Amishadai, wetara ihe-ya nso:


na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahieza nwa Amishadai.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan