Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 18:32 - Bible Nso

32 Unu agaghēbu kwa nmehie bayere ya, mb͕e unu si na ya bulie ihe-ya kachasi nma: unu agaghi-emeru kwa ihe nsọ nile nke umu Israel, unu agaghi-anwu kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ikpe ọmụma agaghị adịrị unu mgbe unu na-eri ya ma ọ bụrụ na unu chere onyinye ndị ahụ kachasị mma nʼihu Onyenwe anyị. Ma kpachapụnụ anya hụ na unu e merụghị onyinye ndị a dị nsọ ụmụ Izrel webatara. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-anwụ.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 18:32
10 Iomraidhean Croise  

ha gādi n'aru Eron na n'aru umu-ya ndikom, mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ma-ọbu mb͕e ha nābiaru nso ebe-ichu-àjà ahu ije ozi n'ebe nsọ ahu, ka ha we ghara iburu ajọ omume, we nwua: ukpuru mb͕e ebighi-ebi ka ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya.


ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.


Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n'ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.


Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n'elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N'isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.


Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu.


Unu gēri kwa ya n'ebe ọ bula, unu onwe-unu na ulo nile unu: n'ihi na ugwọ-ọlu ka ọ buru unu, bú ihe-nkwughachi òfùfè-unu n'ulo-ikwū nzute.


Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,


Ya mere onye ọ bula nke gēri achicha ahu ma-ọbu ṅu iko ahu nke Onye-nwe-ayi mb͕e ọ nēkwesighi, ikpé aru na ọbara nke Onye-nwe-ayi gāma ya.


N'ihi na onye nēri nāṅu kwa, ọ nēri nāṅu kwa ikpé nye onwe-ya, ma ọ buru na ọ tuleghi aru ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan