Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 18:2 - Bible Nso

2 Ọzọ kwa, umu-nne-gi, bú ebo Livai, ebo nna-gi, gi me ka ha soro gi biaru nso, ka ha we rapara n'aru-gi, nēje-kwa-ra gi ozi: ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gānọ n'iru ulo-ikwū ihe àmàm.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 18:2
16 Iomraidhean Croise  

Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n'arum, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai.


Ha we guzo n'ebe-nguzo-ha, dika ikpé-ha si di, dika iwu Moses, bú onye nke Chineke, si di: ndi-nchu-àjà nāwusa ọbara nke ha natara n'aka ndi Livai.


Ma ha gābu ndi nēje ozi n'ebe nsọm, ndi-nlekọta n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo nkem, nēje kwa ozi n'ulo ahu: ha onwe-ha gēb͕uru ndim anu àjà-nsure-ọku-ha na nke àjà ọzọ ha, ha onwe-ha gēguzo kwa n'iru ha ijere ha ozi.


Ma ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, umu Zedok, ndi debere ihe-ndebe nke ebe nsọm mb͕e umu Israel siri n'ebe M'nọ kpafue, ndi ahu gābiakutem nso ijerem ozi; ha gēguzo n'irum iweta nsom abuba na ọbara; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta:


Unu ewe mara na eziteworom unu ihe a enyere n'iwu, ka ọḅuḅa-ndum we diyere Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu.


iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.


Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà.


Ha gārapara kwa n'aru-gi, debe kwa ihe-ndebe nke ulo-ikwū nzute, nke diri òfùfè nile nke Ulo-ikwū ahu: ma onye ala ọzọ agaghi-abiaru nso unu.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.


Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.


Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.


Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan