Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 18:16 - Bible Nso

16 Ma ndi-ha anāb͕aputa site na nke ruru otù ọnwa ka i gāb͕aputa, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, n'ọla-ọcha shekel ise, dika shekel nke ebe nsọm si di (orú gerah ka ọ bu).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe ha dị otu ọnwa, a ga-eji shekel ọlaọcha ise, nʼusoro shekel ebe nsọ, nke bụ iri ihe ọtụtụ gera abụọ gbapụta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 18:16
9 Iomraidhean Croise  

Ihe a ka ha gēnye, onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, nkera shekel dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: (shekel bu orú gerah:) nkera shekel ahu bu àjà-nbuli anēbuliri Jehova.


Ọla-edo nile nke ejiri je ozi ahu n'ije-ozi nile nke ebe nsọ ahu, bú ọla-edo nke àjà-ofufé ahu, di orú talent na iteghete, na nnù shekel na ọgu iri na ọgu isi na iri, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di.


Shekel gābu kwa orú gerah: orú shekel, orú shekel na ise, shekel iri na ise, ka maneh-unu gābu.


Ọ̀rùrù-ọnu-gi nile gādi kwa ka shekel nke ebe nsọ si di: orú gerah gābu shekel ahu.


Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa.


Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova.


Ma ndi anāb͕aputa, bú ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na atọ ahu sitere na ndi eburu uzọ mu nke umu Israel, ndi eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu,


n'aka-ha ka i gānara shekel ise shekel ise n'isi n'isi; dika shekel nke ebe nsọ ahu si di ka i gēwere ha (shekel bu orú gerah):


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan