Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà.
ma gi onwe-gi me ndi Livai ka ha buru ndi nēlekọta ebe-obibi ihe-àmà, ndi nēlekọta kwa lhe-ya nile, ndi nēlekọta kwa ihe nile diri ya: ha onwe-ha ganēbu ebe-obibi ahu, na ihe-ya nile: ha onwe-ha gēje-kwa-ra ya ozi, ọ bu kwa buruburu ebe-obibi ahu ka ha gāma ulo-ikwū-ha.
Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu.
Moses we gwa umu Israel okwu, ndi-isi-ha nile we nye ya nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di nkpa-n'aka iri na abua: nkpa-n'aka Eron di kwa n.etiti nkpa-n'aka-ha.
Ọzọ kwa, umu-nne-gi, bú ebo Livai, ebo nna-gi, gi me ka ha soro gi biaru nso, ka ha we rapara n'aru-gi, nēje-kwa-ra gi ozi: ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gānọ n'iru ulo-ikwū ihe àmàm.
N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu.