Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu.
o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.
tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n'elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai.