Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n'ebe Israel nọ.
Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n'elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron.
Eron we were dika Moses kwuru, b͕abà n'etiti nkpọkọta ahu; ma, le, ihe-otiti ahu amalitewo n'etiti ndi Israel: ọ we tiye ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ, we kpuchiere ndi ahu nmehie-ha.
Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.