Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 16:42 - Bible Nso

42 O rue, mb͕e akpọkọtara nzukọ ahu megide Moses megide kwa Eron, na ha chere iru n'ulo-ikwū nzute: ma, le, igwe-oji ahu kpuchiri ya, ewe hu ebube Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 16:42
10 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.


n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi?


Ebube Jehova biri n'elu ugwu Sainai, igwe-oji ahu nēkpuchi kwa ya ubọchi isi: O si n'etiti igwe-oji ahu kpọ Moses òkù n'ubọchi nke-asa.


Moses na Eron we ba n'ulo-ikwū nzute, puta kwa, gọzie ndi Israel: ewe me ka ndi ahu nile hu ebube Jehova anya.


Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute.


Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.


Moses na Eron we bia n'iru ulo-ikwū nzute.


Ma ọ dighi miri nzukọ ahu nwere: ha we kpọkọta onwe-ha megide Moses, megide kwa Eron.


Moses na Eron we si n'iru nkpọkọta ahu biarute ọnu-uzọ ulo-Ikwū nzute, da kpue-iru-ha n'ala: ewe me ka ha hu ebube Jehova anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan