O rue, mb͕e ha nētib͕u, ma nání mu onwem fọduru, na adaram kpue irum n'ala, tie nkpu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! Ọ̀ bu onye-nbibi nke Israel nile ndi fọduru ka I gābu mb͕e I nāwukwasi Jerusalem ọnuma-Gi?
Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?
o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.