Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 16:28 - Bible Nso

28 Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n'ihi na ha esiteghi n'obim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 16:28
17 Iomraidhean Croise  

O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia.


Ọ si, N'ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n'Ijipt puta, unu gēfè Chineke n'elu ugwu a.


Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu.


I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.


Mb͕e Fero gāgwa unu okwu, si, Merenu onwe-unu ihe-ebube: i gāsi kwa Eron, Were nkpa-n'aka-gi, tuda ya n'iru Fero, ka ọ ghọ ogologo anu.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Unu egela nti n'okwu nile nke ndi-amuma ahu ndi nēburu unu amuma; ndi nēme unu ihe-efu ka ha bu: ọhù nke obi-ha ka ha nēkwu, ha adighi-ekwu site n'ọnu Jehova.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, do iru-gi imegide umu-ndinyom nke ndi-gi, ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta; gi bue amuma megide ha,


N'ihi na, le, M'gaje ifeghari akam n'aru ha, ha gābu-kwa-ra ndi nēfè ha ihe-nkwata: unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezitewom.


Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu.


Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu?


Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n'ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M'kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem.


Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha.


Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.


Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.


N'ihi na esiwom n'elu-igwe ridata, ọ bughi ka M'nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ.


Okwu nke onye-amuma nēkwu n'aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan