Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 16:26 - Bible Nso

26 o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 16:26
13 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi.


Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova.


Sinu n'etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n'otù n'otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n'ajọ omume-ya: n'ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya.


Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya.


Ma onye ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, nke nānughi kwa okwu nile unu, mb͕e unu nāpu n'ulo ahu ma-ọbu n'obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu.


Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm.


Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n'iyì, n'ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n'ego.


N'ihi nka Sinu n'etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka; Mu onwem gākpọbata kwa unu,


Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;


Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.


M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan