Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.
o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.